The Gospel, Igbo, p. 17

Ozioma, Igbu, p. 17

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

Luk 13:1-5 kowara otu ulo elu no n, Jerusalem dagburu ma gbuo madu iri na asato.Ndi Jew chosiri ike i hu osisa ihe nka mere.  Ha wee choputa na obu Chineke nanimara maka ochicho obi ha marakwa echiche madu.  Elegh- anya,ha n,eche si enwere ike,maka iri na asato nke ulo-elu a dagburu bu site maka na nmehie ha di ukuu n,ala Jerusalem.  Chineke puru ikpokota ndi a onu n,otu oge ma kpe ha ikpe Ya ziri ezi.Nka ga aputa na ogwusiwo ndi nmehie ha di uku bu ndi kwesiri i nara ikpe Chineke.  Ndi nke foduru n, Jerusalem (bu ndi nke ulo –elu a n, adagbugh) bu ndi nebi ezi ndu,burukwa ndi ikpe Chineke na abugh maka ha.  Ikwenye n,echiche nka bu kwa ikwenye na nzoputa bu site n,aka oru nke iwu.Jisus doro ndi a aka na nti na ndi di otua ga anara ikpe ebigh-ebi.  O we si ha chegharia—ma wepu uche ha n,iweta onodu ha n, iru Chineke site na aka oru nke iwu.ma tukwasi nani Chineke obi maka nzoputa ha.

Na Hibru 9:9-14, Akwukwo Nso kporo nnata oriri ma o bu emere-eme nzuko nke madu n,eme iru Chineke dika “oru nwuru anwu.”  Na isi akwukwo ndi ozo, onye dekwere akwukwo a kowara anyi n, Hibru 6:1 si na “ntu ala” nke onye nke kwere n, Kraist bu “Ncheghari n, oru nke nwuru anwu ma banyi n, okwukwe n, ebe Chineke di.”  Nkea putara, madu iju itukwasi obi n ‘aka oru nwuru anwu”(dika emume nke nzuko, nnata oriri,etc)tupu ya enwe ezi okwukwe siri ike n, Chineke.

Akwukwo Nso mere ka odo anya.  O buru na madu ekwere na ekpukpere chi ya ga eduba ya n,elu-igwe,  ka onye di otua chegharia (Matiu 3:1-5).  Onye nke Chere na i dobe iwu iri bu ihe di ya oke nkpa i ji ga n, elu-igwe,onye di otua ga echeghariri(Luk 13:1-5).  O buru kwa na onye di otua eche na imeju iwu nzuko ma obu inata oriri bu ihe onye ahu geji aga n,elu-igwe,onye di otua kwesiri ncheghari ma kwusi itukwasi ihe ndi ahu obi maka nzoputa(Hibru 6:1).  Dika nwanyi akowara n,nsape 14,o ga etinye “ego” ya n,akpa ma nara ndu ebigh-ebi dika onyinye nke efu!

Okwukwe na Jisus agagh azoputa gi ma o buru na mgbe i kwerenye na Ya, i we kwenye-kwa na i puru ime baptism, ga ulo uka,ma o bu dobe iwu iri maka enyem-aka nke geduba gi n,elu-igwe. I gagh agunye Jisus nime umu ihe ndi a nile nke i ga eme i duba gi n,elu-igwe.I ga ajuriri ihe ndia nile dika ihe ndi na agaghi eduba gi n,elu-igwe ma kwere nani n Jisus Kraist.

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

 Cover     2     3     4     5     6     7     8     9     10     11     12     13     14     15     16     17     18     19     20     21     22     23     24     25     26     27      n’azụ cover