The Gospel, Igbo, p. 23

Ozioma, Igbo, p. 23

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

Anyi ganogide na nmehie?

Maka onwegh nmehie gegbochi onye kwere ekwe ndu ebighebi bu nke enyere ya n, efu n, ofu oge.  Nmehie nwere ajo oru na ndu di ugbua ma o bu ndu n, abia-abia.

Na mbu, o nwere ihe n, eso nmehie.

Onye nke nanubiga nmanya oke nwere ike igbu onwe ya ma o bu gbuo onye aka ya di ocha na ihe mberede.  Onye nakwa iko nwere ike ibute oria obiri n,aja-ocha ma nwuo n, ihi nkea.  Ima Kraist dika onye Nzoputa ga azoputa madu n,aka oku ala mmuo,ma o gagh anaputa onye ahu naka ihe n,eso nmehie ma o bu ndu ruru aru (Hu Ndi Galetia 6:7-8,Jemes 2:14-17).

Nka abuo,onwere ihe ebigh-ebi n,eso nmehie.

Igbara akwukwo eji abanye n, ogbo egwuru-egwu ga enwetara onye ahu ohere iji banye ebe ahu, ma enwere ike o gagh enwetara onye ahu oche ndi di n,iru.  Otu o di,Madu puru inweta ndu ebigh-ebi bu onyinye amara n,efu site n, okwukwe nime Jisus Kraist,Ma nkea nwere ike o gagh enye onye ahu okwa di elu n,Ala Eze nke Chineke.  Okwa anyi n,elu-igwe na nrite nile anyi n, ime okwa ahu ga esite na ndu di Nso na oru aka anyi di ezi nma nke anyi biri ma gosikwa n, uwa (Ndi Korint 3:11-17,9:24-27,2nd Ndi Korint 5:10-11).Enwere ike, ihe uto nke nmehie n,uwa nwere ike i diri anyi oke mkpa karia nrite anyi n,elu-igwe nke dika o di oke anya.  Akwukwo Nso na akowa na ndi ahu lere ihe nrite ha laa n,iyi (Nrite nke ha gerite n, elu-igwe) maka ihe uto nke nmehie n,adigh adigide otu ubochi getiriri oke mkpu mgbe ha geji anya ha hu ka ihe nnrite nke ha kwesiri irite ga esi ha n,iru gafe ebe ha n, achu ihe uto nke nmehie nke uwa na adigh adigide (Ndi Hibru 12:14-17,Luk 9:11-17,Matiu 25:14-30).

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

 Cover     2     3     4     5     6     7     8     9     10     11     12     13     14     15     16     17     18     19     20     21     22     23     24     25     26     27      n’azụ cover