The Gospel, Igbo, p. 12

Ozioma, Igbo, p. 12

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

Jisus bu Chineke.Ya na Nna Ya bu otu n,ebigh-ebi.O ghoro madu maka I ji nwuo n,elu obe maka nmehie anyi.Nke a egbochigh Ya ibu Chineke.

Tomas zara,si Ya, ‘Onye-nwem na Chinekem”.Jisus si ya,N,ihi na i huwom,i kwerewo? Ngozi gadiri ndi akahugh,ma ha ekwere.”       Jon 20:29-30

(Hu kwa Jon.1:1,Jon 8:58-59,(C. f, Opupu 3:13-14),Jon 10:30,1 Timoti 3:16,Taitos 2:13,Colose 2:2,9,Ndi Hibru 1:8).

Ndi obula nekwegh na Jisus bu Chineke ga anara ikpe omuma ebigh-ebi. Jisus si:

Unu onwe-unu si n,ebe di ala puta,Mu Onwem si ebe di elu puta,Unu onwe –unu si n, uwa puta,Mu Onwem esigh n,uwa nkea puta.Ya mere M, siri unu, na unu ganwu na nmehie nile unu:n,ihi na o buru na unu ekwegh na Mu Onwem bu Ya.Unu ganwu na nmehie nile unu.       Jon 8:23-24

(Hu kwa Jon 11:25-27,Olu ndi ozi 9:20,16:30-31,1 Jon 5:13)

Gini mere Chineke jiri bia n, oyiyi Madu?

Na pej 5 anyi huru na Chineke di Nso ebigh-ebi.obulagh obere nmehie na esi ya onwe ya isi .Maka nkea, aga akwu-riri ugwo nmehie ebigh-ebi maka nmehie madu nile.Ma otu o di,enwere uzo abuo a geji akwu ugwo a:Madu efu ga anara iwe oku Chineke nke bu ebigh-ebi,Ma o bu ofu onye bu ebigh-ebi ga anara iwe oku Chineke n,oge nta.Ha dum bu i ji kwuo ugwo ebigh-ebi nke nmehie.

1.  Madu nke nwere ogwugwu aghagh i nara iwe oku Chineke nke bu ebigh-ebi ma o buru na o ga akwu ugwo nmehie nile ya.Ya kpatara oku nmuo ji buru ebigh-ebi.

2.  Jisus Kraist,bu Chineke ebigh-ebi n, oyiyi madu,jiri nana iwe oku Chineke na nwa oge nta.Dika o bu Chineke,ahuhu nke o tara ma die n,elu obe bu aja nke n,enwegh ogwugwu.N,ihi nke a,onwu Ya wetara anyi aja nke ebigh-ebi nke nmehie maka madu nile na agburu nile.

A ghagh ikwu ugwo nmehie nile nke madu nile.Chineke nyere efe ka madu obula kpebie uzo o gesi kwuo ugwo nmehie ya

. . . . Jisus Kraist, ma o bu oku ala nmuo ebigh-ebi.

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

Cover     2     3     4     5     6     7     8     9     10     11     12     13     14     15     16     17     18     19     20     21     22     23     24     25     26     27      n’azụ cover