The Gospel, Igbo, p. 27

Ozioma, Igbo, p. 27

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

DIKA AKWUKWO A SIRI DI

N, ubochi taa, otutu ‘ozi oma” di iche- iche ejuputala n, ikuku na ebe di elu di iche-iche n, uwa.Ufodu na eji nwayoo agwa ndi nmehie furu efu ka ha “zipu ozi ka Jisus bata n, obi ha” ma o bu i gwa ndi nke n,ekwegh-ekwe ka ha ‘chegharia n, nmehie ha.”  Nkea abugh ihe itunanya.  Ma ndi kwere-ekwe ma ndi n, ekwegh-ekwe ka a hapuru na mgbagwoju-anya.  O bula di mgbe a na agbasa ozi oma ziri ezi bu nke kwuru oto, onye nke na anu ozi a ga ato nti n,ala na okwu onye ozi oma were n, ayo okwu ndia ma o bu ozi oma dika a na anubu ya n, oge gara aga,bu nke geme o gagh ayota nke bu ozi oma nnaputa nke Jisus Kraist.Maka nkea nime echiche anyi, Eweputara akwukwo ozi oma ma dee ya i ji kowa obuladigh ihe di oke onu ahia nke okwukwe nnaputa dika onwu Onye nwe anyi, iji naputa anyi,na kwa nkuzi nke amara, kama e edere ya i ji kwuputa ma dozie na uzo ziri ezi bu nkuzi asi nke nesi ebe nile di iche-iche na aka ndi otu Kraist.  Ime ka edozie ihea nile di oke mkpa mere ka o wee ruo ihe dika afo ise n, iji dee akwukwo a ma dozie ya n,uzo di ogo.  Anyi amagh maka akwukwo ozo nke edere n, ubochi taa nke puru ikowa n, udi puru iche ozi oma di otua.

O bu ochicho obi anyi ka akwukwo a n, akuzi gbasara nnaputa gbasara ebe nile di iche-iche.  Otuto otu mgbasa ozi nke Kraist n, uwa nile ka enyere ike ibiputa akwukwo a ma kesaa ya n, obodo ha di iche-iche.  Site na mgbali otu uka di iche-iche nakwa otu oru ebere di iche-iche,atapia-la akwukwo a n, asusu ndi nke di ukuu di iche-iche na uwa nile.O buru n, ibu onye nwere nka n, ihe gbasara asusu nke a nedigh n, igwe ngbasa ozi anyi, ma o bu imara onye nwere nka n, asusu,biko kpoturu anyi.  Me ka anyi jiko aka ime ka akwukwo ozi oma a rute otutu madu nile site n, asusu di iche-iche.

NKOWA GBASARA ONYE DERE AKWUKWO A

Ron Shea gara ulo akwukwo Mahadum Villanova afo ano site n, onyinye igu akwukwo n,efu bu nke sitere n,aka ndi agha ugbo nmiri ndi mba United States.  Mgbe onwetasiri akara nzere di elu n, ihe gbasara igwe oku nka -na –uzu, o banyere otu ndi agha ugbo nmiri.  Dika nkea,o debara aha ya n, ulo akwukwo Dallas Theological Seminary bu ebe o tinyere isi imu ihe gbasara Agba ohu nke akwukwo Nso na kwa kesi atapia ya n, asusu ma kowaa ya, Maka nkea, nwa amadi a were asusu Grik bu nke e jiri dee agba ohu nke akwukwo Nso tapia ya n, asusu inglish.O nwetere akara nzere Master ma turukwa ugo n, ihe gbasara omumu Tioloji.  O gakwara n,ihu irite akara nzere Dokto maka ikpe n, ulo akwukwo Mahadum nke California, Ulo akwukwo ikpe Hastings, bu ebe o nwetara ihe nrite di iche-iche bu ebe etuwere ya ugo maka, nkwuba oto nke ikpe, ikpe di elu na kwa nsim agugo onu di n, ikpe.Nwa Amadi a aburula onye ozuzu aturu na nzuko di iche-iche bu ndi di na New Orleans na kwa San Francisco.  O bu onye toro nto-ala ma buru onye isi Clear Gospel Campaign.

                           

Gara aga peeji nke               Peeji na-esonụ

 Cover     2     3     4     5     6     7     8     9     10     11     12     13     14     15     16     17     18     19     20     21     22     23     24     25     26     27      n’azụ cover